FeaturedSports

AFCON 2019: South Africa kwetara na ha ma ụzọ ha ga-eji merie Naijiria: Segun Odegbemi

Views

Otu Kaptin gara aga ndi Super Eagles bụ Segun Odegbami akọwaala ndi Super Eagles dịka ‘Underdogs’ maka asọmpi ndi otu Super Eagles nke Naijiria na South Africa n’ụbọchị Wenezde.

Dịka Odegbami siri kwuo, otu Super Eagles kwesiri igbalị ọfụma iji hụ na ha meriri ndi South Africa, n’ihi na ndi South Africa chere na ha amatala ụzọ ha ga-eji merie ndi Naijiria.

Ọ kpọrọ ndi Naijiria ‘underdogs’ maka na o chere na ndi South Africa nwere ụdị echiche ga-enyere ha aka imeri. Odagbemi kwuru na asọmpi ndi agbarala na mbụ, na ndi South Africa na-emeri. O kwuputara na o kwenyere n’ihe Naijiria pụrụ ime mana ụjọ South Africa na-atụ ya n’ihi otu ha siri merie ndi Egypt n’Obodo ha.

Ọ gwara ndi Super Eagles ka ha kwado ọfụma ịhụ na ha wepụrụ ndi South Africa ma bulata iko asompi a.

Leave a Reply