Entertainment

AFCON 2019: Ndi Super Eagles eruola Ismaila maka asompi

Views

Otu egwuregwu bọọlụ Naijiria bụ Super Eagles eruola Ismaila nke dị n’Egypt maka agba kampụ nke abụọ maka nsọmpi ‘African Cup of All Nations (AFCON). Naijiria bụ ndi mepere kampụ AFCON na Delta Steeti ebe ha gbasoro mba Zimbabwe iji kpọọ ha ahụ ọkụ na nkwado.

Ndi Super Eagles ahapụla Naijiria na nkwado agba nke abụọ ebe ha na ndi Zimbabwe gbara bọọlụ na-enweghi ndi meriri ibe ha.

Tụpụ ha emee njem, onyeisi nlekọta Super Eagles bụ Gernot Rohr kpọpụtara ọnụọgụgụ mmadu iri abụọ na atọ ga-agba bọọlụ AFCON n’ụbọchị Sọndee. Kelechi Iheanacho nke otu Leicester City na Semi Ajayi nke Rotherham United bụ ndi ọ gụpụrụ maka asọmpi a.

Na nkwado agba kampụ nke abụọ, Naijiria ga-agba Senegal n’ụbọchị iri na isii n’ọnwa Juun. Super Eagles ga-anọ na ‘Port of Alexandria’ ebe ha na mba Guinea, Burundi, na Madagascar ga-anọkọta mejuo otu B na AFCON.

Leave a Reply