FeaturedIgbo News

Achụọla otu nwaanyị n’ọrụ maka ịgba akaebe n’ụlọ ụka TB Joshua

Views

Onyeisiala Sierra Leone, Julius Bio, achụọla State Chief of Protocol (SCOP), Edna Kargbo n’ọrụ, n’ihi akaebe nke ọ gbara n’ụlọ ụka.

Kargbo bụ onye bịara Naịjirịa ịgba akaebe ihe Chukwu meere ya na Synagogue Church of All Nations nke TB Joshua nwe.

Nwaanyị a gosiri ihe nkiri nke na-egosi leta ọrụ o nwetara nakwa nnukwu ụlọ ma na-akọwa na Chukwu egosila ịdimma ya na ndụ.

Dịka ndị International News Agency siri kwuo, obi adịghị Gọọmenti Sierra Leone mma n’ihi na ha na-agba mbọ ibelata otu ha si emefu ego.

Leta enwetara n’Ọfiisi Onyeisi ala Sierra Leone kwuru, ‘Ụlọ ọrụ a anapụla Kargbo ọrụ ya n’ihi akaebe ọ gbara n’ụlọ ụka Naijiria. A ga-ebido nnyocha nke gbasara ihe enwe enwe nke nwaanyị a’.

Ọzọkwa, Anti-Corruption Commission emepela akwụkwọ maka nnyocha ọrụ Kargbo nakwa otu o siri nweta ego o jiri rụọ nnukwu ụlọ ya na ihe enwe enwe ndị ọzọ. Ha kwuru na ọ bụrụ na-achọpụta n’ụzọ o siri nweta ego adabaghi n’usoro anti-corruption act, aga akpọpụ ya ụlọ ikpe.

Leave a Reply