FeaturedIgbo News

Achọpụtala ebe a na-emegbu mmadu na Daura

Views

Ndị uwe ojii na Mọnde, chọpụtara ebe ọzọ a na-emegbu ndị mmadu; ndị ruru mmadu narị atọ, n’ebe bụ ebe e kwesiri imezi agwa ụmụaka, na Daura, Katsina steeti.

Ndị TVC kwuru na ndị uwe ojii gara n’ebe a n’ihi ọgbaaghara nke ndị anwụchiri ebe ahụ nakwa mkpọtụ maka mkparị ha na-anata.

Ebe a na-emegbu ndị mmadu ka e kwuru na otu Malam Bello bụ onye na-ahazi ebe ahụ na Daura. A chọpụtakwara na ebe a eteela aka ọ dịwara.

N’ọnwa gara aga, a chọpụtakwara ebe dị otu a na Kaduna steeti, ebe ndị eji eji ebe ahụ dị mmadu narị anọ.

Leave a Reply