FeaturedSports

Achọghizi m ịnọ PSG: Mbappe

Views

Kylian Mbappe agwala ndi Paris Saint-Germain na ha na ya agaghị anọ n’ọdịnihu. Kylian, nwokorobia dị afọ iri abụọ anọọla na PSG kemgbe sizini abụọ mana ha kwekọrịtara na Kylian ga-anọgide ruo afọ 2022.

Ndi Real Madrid nwere anya n’ebe Kylian nọ mana ebe ọ bụ na Kylian so na ndi a na-akwụlite ụgwọ, Real Madrid na PSG anaghị ama aka n’ihe gbasara ego.

Mana ndi Spanish Newspaper ekwuola na ego abụghị mkpa ya nke mere na ọ gaghị anọ na PSG na-agbanyeghị ụdị ego ha nyere ya. Real Madrid n’aka nke ha enweghi ego ịzụnarị Kylian maka ego ha mefuru n’inweta Eden Hazard nke Chelsea.

Leave a Reply