Igbo News

Abubu oru ndi ASUU agaghi enye aka n’ihe banyere ntuliaka Febuari 16 – Saraki

Views

Onyeisi Senate ala anyi Naijiria bu Bukola Saraki ariola Onyeisiala President Muhammadu Buhari ka o leba anya n’abubu oru ndi ASUU ka umuakwukwo nwee ike i laghachi ga malite akwukwo.
N’ozi nke o si n’onu onye mgbasaozi ya Yusuph Olaniyonu, were zi, o kowara na ndi ntorobia mebere opekata mpe 51% ndi ga-atu akwukwo. O gara n’ihu kowaa na otutu ndia bu umuakwkwo ma gbatakwa PVC ha n’uloakwukwo ha. O buru na ha noro n’ulo ruo oge a ga-atu akwukwo, vootu ha ga-abu ihe lara n’iyi.
O mere ka a mata na ha di nkwadobe igba mbo mee ka ndi ASUU na ndi Goomenti Etiti kpazie nke oma ka umuakwukwo nwee ike ilaghachi uloakwukwo ha.

Leave a Reply