Igbo News

Abiaghi m Nhibe Buhari maka na O ziteghiri m Akwụkwọ ozi – Obasanjo

Views

Gọọmentị etiti na-ajụ ihe kpatara na ahụghị Obasanjo n’ụbọchị emume ọchịchị onye kwuo uche ya ebe ọ bụ na e zigara ya akwụkwọ ozi gbasara emume a. Emume a bụ nke emere n’ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Juun.

Onye na-anọchị anya gọọmentị n’ihe gbasara ọrụ dị iche iche bụ Garba Shehu kwuru na Onyeisi ala gara aga bụ Obasanjo ikwu na ọ nataghị akwụkwọ ozi ọbụla bụ asị. O kwuru na Obansanjo abịaghị nhibe Buhari dịka onye isi obodo Naijiria n’ụbọchị iri abụọ na itoolu nke ọnwa May, ma bụrụkwa onye achọrọ achọ n’ụbọchị emume onye kwuo uche ya. O kwuru na o nwere ike ọ bụrụ na ha na-ese okwu.

Ọzọ dika ibe ya bụ na ọ bụghị naani Obasnajo bụ onye ọchịchị achọrọ achọ n’ụbọchị ahụ. E kwuru na ndi isi ala niile chịrịbụrụ Naijiria tụpụ Buhari abanye n’ọchịchị enweghi nke biaranụ.

Leave a Reply