FeaturedIgbo News

A nwụchiela otu ụkọchukwu n’Enugu

Views

Ndị uwe ojii nke Enugu Steeti na Tuzde, nwụchiri otu ụkọchukwu, Sunday Egbo, onye e nwetara igbe ozu na uwe ime ụmụnwanyị n’ụlọ ya.

Samuel bụ onye nwe Christ Mercy Ministry, nke dị n’Ajuonu Obukpa, n’Enugu.

Ndị uwe ojii bidoro inyocha nwoke a mgbe o dinara onye ụlọụka ya n’ike. Nke a mere e jiri nwụchie ya ma nyochawa ya.

O kwuru na ihe ndị a e nwetara n’ụlọ ya bụ ihe ndị dibia si ya weta ka o nwe ike nweta otu akpa ego.

Ụkọchukwu a jiri ohere a dụọ ụkọchukwu ndị ọzọ ọdụ.

Leave a Reply