FeaturedIgbo News

A gụpụla Osinbajo na gọọmentị Buhari – Afenifere

Views

Otu ndị Yoruba a na-akpọ Afenifere, kwuputara na Osote Onyeisi ala Yemi Osinbanjo esoghizi na gọọmentị Buhari.

Ihe kpatara okwu a bụ na Onyeisi ndị ọrụ Onyeisi ala Muhammadu Buhari, Abba Kyari gara London inye Buhari akwụkwọ iwu ọhụrụ, ebe Yemi Osibanjo nọ na Naijiria.

Onye nkwuchite ọnụ Afenifere, Yinka Odumakin, gwara ndị Punch na Tuzde, na ọ bụ otu onye na-achịzi Naijiria, ebe ọ bụna Buhari enyefeghi osote ya ọchịchị mgbe ọ na-akwado njem ya.

Ha kwuru na nke a na-arụtụ aka na ala adịghị mma na Presidential Villa.

 

Leave a Reply