FeaturedIgbo News

A ga-ebido ‘Operation Crocodile Smile’ na Lagos na Ogun

Views

Ndị 81 division nke Amị  Naijiria, ekwuola na ha ga-ebido ‘Operation Crocodile Smile’ na Tuzde, na Lagos na Ogun steeti.

Onye na-anọchi anya onye ntụziaka Army Public Relation, Kamarudeen Adegoke, kwuru na a ga-ebido emume a na Nọvemba 19th ruo Decemba 25th.

Ha kwuru na nke a ga-enye aka ibelata ntọrọ mmadụ, izu ohi, igbu mmadu na mpụ ndị ọzọ dị iche iche.

O kwuru na a ga-enwe onyinye ọgwụ ebe dị iche iche, mmezi ụzọ ndị a ga-ahọrọ na inye ụmụakwụkwọ onyinye dị iche iche.

Ya mere, ọ gwara ndị mmadu ka ha ghara ịma jiji.

Leave a Reply