FeaturedIgbo News

A ga-arụcha ọdụ ụgbọelu Enugu tupu agbaa ekeresimesi: Aviation Minster

Views

Minista nke Aviation, Hadi Sirika, kwuru na a ga-emepe ọdụ ụgbọelu Akanu Ibiam, nke dị n’Enugu maka ime njem tụpụ emume ekeresimesi.

N’okwu nke ọ gwara ndi Channels TV, Sirika kwuru na-ebidola ọrụ ebe ahụ, nakwa na ọ bụrụ na-enweta ego dịka a tụrụ anya, Gọọmenti Etiti ga-emepe ya n’oge akaraka.

O kwuru na ha na-agba mbo ịhụ na-arụziri ụzọ ụgbọelu na-agba ọfụma, ka ihe mere na Port Harcourt ghara ime na Enugu.

Ọ kọwara na mgbe ụzọ ụgbọelu mebiri n’ọdụ ụgbọelu nke Port Harcourt, Minista nke Aviation, mgbe ahụ, nwara ike ye imezi ya, mana a na-eme, ọ dịka anaghị eme. N’agbanyeghị mgbalị minister a, otu ụgbọelu ‘Air France’ zutere ihe mberede ebe ahụ.

Ya mere, Sirika na-ekwu na a ga-arụsị ọdụ ụgbọelu ike ka agadi nwanyi ghara ịda ada nke ụgbọrọ abụọ.

Leave a Reply