EntertainmentSports

A ga-agba Asọmpi Iko Mbaụwa 2020 nke ụmụnwanyị U-20 na Naijiria: FIFA

Views

Kemgbe afọ iri, Naijiria anabatabeghi mba ụwa ndi ọzọ maka iko mba ụwa. Ka ọ dị ugbu a, a na-ele anya na Naijiria nwere ike ịnabata obodo ndi ọzọ maka egwuregwu iko mba ụwa nke afọ 2020, nke ụmụnwanyi na-erubeghi afọ iri abụọ.

Otu ụlọọrụ Nigeria Football Federation bụ ndi nyegidere otu na-ahụ maka egwuregwu bọlụ nke ụwa bụ Federation of International Football Association (FIFA) nsogbu ka Naijiria nabata mba ụwa ndi ọzọ maka nsọmpi a.

Amaju Pinnick

Onyeisi ụlọ ọrụ NFF, Amaju Pinnick, kwuru na ndi kọmitii FIFA ga-abịa ile anya ụbọchị anọ n’ọnwa Ọgọstụ iji mara ma obodo Naijiria otozuru etozu ịnabata ya bụ egwureguwu nke 2020. Ihe ndi ha na-agụkọ bụ nchekwa, ụlọ ọgwụ na ihe ndi ọzọ.

Dika e kwuru, ụlọ ọrụ FIFA nwere ike imefu ego ruru nde dollar anọ na ya bụ egwuregwu. Nke mere na Naijiria ga-erite uru na ya bụ emume.

ihe bu okwu buzi ma Naijiria otozukwara.

Leave a Reply