FeaturedIgbo News

A chụọla ndị kọpa abụọ n’Ebonyi steeti maka ha achọghị iyi ‘trouser’ NYSC

Views

A chụọla ụmụnwanyị abụọ, ndị na-efe ala nna ha na 2019 Batch C Stream 1, n’Ebonyi steeti maka na ha ekweghi eyi trauza nke ndị NYSC nyere ha.

Ndị na-efe ala nna ha, ndị Batch C ka na-eme emume ‘three-weeks orientation exercise’, n’akụkụ Naijiria dị iche iche.

Aha kọpa ndị ihe metutara bụ Okafor Love Obianuju na Odji Oritsetsolaye. Onye nkwwuchite ọnụ NYSC Ebonyi steeti, Ngozi Ukwuoma, kwuru na a hụrụ ụmụagbọghọ ndị a, ebe ha yii sket, n’agbanyeghi na NYSC nyere ha trauza na shọọtụ ha kwesiri iyi.

Ụmụagbọghọ ndị a kwuru na ha agaghị eyi shọọtụ n’ihi okwukwe ha.

Ndị ọrụ NYSC gbara mbọ ebe ọ dị ukwuu, ịhụ na akọwara ndị kọpa a iwu NYSC mana okwu ha niile dị ka ebe a na-awụ mmiri n’elu okwute.

A chụpụrụ ha maka nnupu isi.

Leave a Reply