Igbo News

Views

Gọvanọ ndi Zamfara Steeti bụ Bello Matawalle eweputala nde naira iri asatọ na atọ ejiri zụọ ehi nari asaa na iri ise maka emume Eid-el-fitri.

O kwuru na ehi ndi a bụ nke egburu nye ndi ụwa na-atu n’ọnụ, ndi enweghi nne na nna na ndi na-enweghi di na local gọọmentị iri na anọ dị na steeti ahụ.

Onye kwuru okwu a bụ Idris Gusua bụ onye na-ekwuchitere steeti okwu. Ọ sịrị na ụdị emume a so n’ ụzọ gọọmentị steeti si amuba ọdị mma ndi mmadu.

Ehi ndi a egburu ka ekere ka onye ọ bụla nwee ike ime emume ‘Eid-el-fitri’ na-agbanyeghi otu ọnọdụ enweghi ego na nchekwaba siri dị na steeti.

Matawalle rịọrọ ndi bi na steeti Zamfara ka ha were ohere emume a kpee ekpere maka udo na mmepe n’ obodo ha.

Leave a Reply